2 Corinthians 10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Anyị bụ ndị Chineke họpụtara
1Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke Kraịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu. 2Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya. 3Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị. 4Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi. 5Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst. 6Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke.
7Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya. 8Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a. 9Achọghị ka ọ dịka m a ga-asị na m sitere nʼakwụkwọ ozi m na-emenye unu egwu. 10Nʼihi na ha na-asị, “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike, ma na mmadụ, ma nʼọdịdị ya na mmadụ adịghị ike, okwu ọnụ ya bụkwa ihe na-abaghị uru.” 11Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu.
12Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta. 13Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ. 14Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst. 15Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto. 16Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ. 17Ma, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.” 18Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.

Did you know?
Letters, Presence, and Warfare Not of This World
- Some people measured Paul by appearances and by his speech. They granted that his letters were weighty and forceful, yet called his physical presence unimpressive and his speaking of no account. He replies that what he is in his letters when away, he will be in his actions when he is present.Sources: the Bible text itself
- He casts the conflict in military terms, but not as an ordinary fight. Living in the flesh, he says, does not mean waging war according to the flesh. The weapons he claims are not the world's; they have divine power to pull down strongholds, to dismantle arguments and every presumption set against the knowledge of God, and to bring every thought into obedience to Christ.Sources: the Bible text itself
- Paul will not boast beyond the field of influence God has assigned him, a field that already includes his readers, since he was the first to reach them with the gospel of Christ. Anyone who boasts, he says, should boast in the Lord; approval belongs not to the one who commends himself, but to the one whom the Lord commends.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Corinth · 37.906, 22.879 · verse 14
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org