2 Chronicles 30
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Mmemme Ngabiga
1Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. 2Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ. 3Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem. 4Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a. 5Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.
6Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si:
“Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị. 7Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya. 8Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ. 9Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.”
10Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo. 11Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem. 12Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
13Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko. 14Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
15Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 16Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja. 17Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị. 18Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla 19bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.” 20Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.
21Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
22Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.
23Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ. 24Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ. 25Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa. 26Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem. 27Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.
Did you know?
Hezekiah’s Passover Celebration
- Hezekiah and the assembly in Jerusalem postponed the Passover to the second month because an insufficient number of priests had consecrated themselves in time and the people were not yet gathered.Sources: the Bible text itself · Hezekiah
- The king sent couriers with letters across the land from Beersheba to Dan, inviting survivors of the Assyrian invasions from northern tribes like Ephraim, Manasseh, and Asher to worship together in Jerusalem.Sources: the Bible text itself · Beersheba · Assyria
- When many northern visitors ate the Passover meal without undergoing the ritual purification required by the Law of Moses, Hezekiah prayed that God would pardon everyone whose heart sincerely sought Him, and the Lord healed the people.Sources: the Bible text itself · Moses
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 1, 2, 3, 5, 11, 13, 14, 21, 26
- Dan · Today: Tel Dan · 33.249, 35.652 · verse 5
- Assyria · 36.359, 43.153 · verse 6
- Kidron · Today: Kidron River · 31.780, 35.240 · verse 14
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org