Nations Bible

2 Chronicles 12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Shishak ebusoo Jerusalem agha

1Ma mgbe e mere ka alaeze Rehoboam guzosie ike, mgbe ọ dịkwa ike, ọ hapụrụ iwu Onyenwe anyị ya na ndị Izrel niile. 2Nʼihi na ha ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem agha nʼafọ nke ise nke ọchịchị eze Rehoboam. 3O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt. 4O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.

5Mgbe ahụ, Shemaya onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndịisi Juda niile, ndị zukọtara na Jerusalem nʼihi egwu Shishak, sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Unu ahapụla m, nʼihi ya, ahapụkwala m unu, nyefee unu nʼaka Shishak.’ ”

6Ndị ndu Izrel na eze wedara onwe ha nʼala sị, “Onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ.”

7Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, “Ebe ọ bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m. 8Ma otu ọ dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata ọ dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi.”

9Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 10Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya. 11Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-eso ya buru ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.

12Mgbe eze wedara onwe ya nʼala, iwe Onyenwe anyị na-eweso ya dajụrụ, Ọ laghịkwa ya nʼiyi kpamkpam. Nʼezie, ezi ihe fọdụkwara na Juda.

13Eze Rehoboam mere onwe ya ka ọ dị ike na Jerusalem na-achịkwa ka eze. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. 14O mere ihe ọjọọ, nʼihi na ọ dịghị mgbe ọbụla o kpebiri nʼobi ya ịchọ Onyenwe anyị.

15Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Shemaya onye amụma na nke Ido onye ọhụ ụzọ, nke na-ahụ maka ihe banyere usoro ọmụmụ niile? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha. 16Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Did you know?

Shishak's Invasion and Rehoboam's Reign

  • In the fifth year of Rehoboam's reign, Pharaoh Shishak (identified as Sheshonk I) invaded Judah with a large coalition army, capturing fortified cities and reaching Jerusalem. Records of Shishak's military campaigns have been preserved on the portico at Karnak, in ancient Thebes.Sources: Shishak · the Bible text itself
  • After Shishak seized the treasures of the temple and the royal palace, including the gold shields made during Solomon's reign, Rehoboam replaced them with bronze shields. Royal guards carried these bronze substitutes whenever the king went to the house of the LORD, returning them to the guardroom afterward.Sources: the Bible text itself · Shishak · Solomon
  • The account of Rehoboam's reign cites historical records compiled by the prophet Shemaiah and the seer Iddo. Shemaiah delivered prophetic warnings to Judah's leaders during the Egyptian invasion, while Iddo wrote genealogical and historical accounts.Sources: the Bible text itself · Shemaiah · Iddo

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Egypt · 30.129, 31.308 · verses 2, 3, 9
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 2, 4, 5, 7, 9, 13
  • Ammon · 31.955, 35.934 · verse 13
  • City of David · 31.774, 35.236 · verse 16

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.