2 Chronicles 10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Nnupu isi Izrel megide ọchịchị Rehoboam
1Rehoboam gara Shekem nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze. 2Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta. 3Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya: 4“Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”
5Rehoboam zara ha sị, “Bịaghachikwutenụ m mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.
6Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”
7Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emere ha ihe ọma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.”
8Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ. 9Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ”
10Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m. 11Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ”
12Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.” 13Eze sara ha okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ ndị okenye 14ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere, ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.” 15Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Chineke nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.
16Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị,
“Olee oke anyị nwere nʼime Devid?
Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi?
Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu!
Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.”
Nke a mere, ka ndị Izrel niile laa nʼụlọ ha. 17Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha.
18Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye ma ndị Izrel ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem. 19Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.

Did you know?
The Division of the Kingdom
- Rehoboam traveled to Shechem to be confirmed as king, where the assembly demanded relief from the heavy forced labor and taxation imposed under Solomon. Jeroboam, a former supervisor of forced labor who had fled to Egypt, returned to represent the people's appeal.Sources: the Bible text itself · Rehoboam · Jeroboam
- Rehoboam rejected the counsel of his father's veteran elders to speak kindly to the people, choosing instead the harsh answer suggested by the young men who grew up with him. The biblical narrative notes that this turn of events fulfilled the prophecy delivered by Ahijah the Shilonite.Sources: the Bible text itself · Ahijah
- When the northern tribes revolted from the house of David, Rehoboam sent Hadoram, his superintendent over forced labor, to address them. The Israelites stoned Hadoram to death, forcing Rehoboam to flee in his chariot to Jerusalem.Sources: the Bible text itself · Adoniram
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Shechem · Today: Tell Balatah · 32.214, 35.282 · verse 1
- Egypt · 30.129, 31.308 · verse 2
- Shiloh · Today: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · verse 15
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 18
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org