1 Samuel 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
1Ya mere, ndị ikom Kiriat Jearim bịara buru igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị bubata ya nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu. Ha doro Elieza, ọkpara Abinadab nsọ, ka ọ bụrụ onye na-elekọta igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
Mmeri Samuel meriri ndị Filistia na Mizpa
2Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị. 3Ya mere, Samuel gwara ezinaụlọ Izrel niile sị, “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na alaghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ, wezuganụ chi niile nke ndị ala ọzọ, na arụsị Ashtọret site nʼetiti unu. Kpebienụ nʼobi unu ịbịakwute Onyenwe anyị, feekwa naanị ya ofufe. Ọ ga-anapụtakwa unu site nʼaka ndị Filistia.” 4Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị Onyenwe anyị.
5Samuel gwara ha sị, “Unu ndị Izrel, zukọtaanụ na Mizpa, ka m rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ nʼisi unu.” 6Mgbe ha niile zukọrọ nʼebe ahụ, ha kuuru mmiri wụpụ ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. Nʼụbọchị ahụ kwa, ha buru ọnụ, kwupụta mmehie sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị.” Ọ bụ na Mizpa ka Samuel malitere ikpe ụmụ Izrel ikpe.
7Mgbe ndị Filistia nụrụ na ụmụ Izrel zukọrọ na Mizpa, ndị eze ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha, bịa ibuso Izrel agha. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ na ha na-abịa nso, ha tụrụ ụjọ nke ukwuu. 8Ha sịrị Samuel, “Akwụsịla itiku Onyenwe anyị Chineke anyị mkpu akwa nʼihi anyị, kpeekwa ekpere ka ọ zọpụta anyị site nʼaka ndị Filistia.” 9Mgbe ahụ, Samuel weere nwa atụrụ na-aṅụ ara jiri ya chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, rịọkwa Onyenwe anyị ka o nyere Izrel aka. Onyenwe anyị zara ekpere ya.
10Nʼoge ahụ, mgbe Samuel nọ na-esure aja nsure ọkụ ahụ, ndị Filistia bịaruru nso ibuso Izrel agha, ma Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe were oke olu egbe eluigwe nke dara oke ụda chụsasịa ha. O mere ka ọgbaaghara bata nʼetiti ndị Filistia. Nke a mekwara ka ụmụ Izrel kpochapụ ha, 11Ndị ikom Izrel si na Mizpa pụta chụso ndị Filistia ọsọ, na-etigbu ha nʼụzọ ruo na ndịda Bet-Ka.
12Mgbe ahụ, Samuel weere otu nkume doo ya nʼagbata Mizpa na Shen, kpọọ ebe ahụ, Ebeneza, nke pụtara, “Nkume inyeaka,” nʼihi na ọ sịrị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyerela anyị aka ruo ugbu a.”
13Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel. 14E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait.
15Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya. 16Afọ niile, ọ na-ejegharị site nʼotu obodo ruo nʼobodo ọzọ, site nʼobodo Betel ruo Gilgal, ruokwa Mizpa. Ọ na-anọkwa nʼobodo ndị a na-ekpe ndị Izrel ikpe. 17Ma ọ na-alọghachi na Rema, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka ụlọ ya dị. O kpekwara ndị Izrel ikpe nʼebe ahụ, wuokwara Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ.

Did you know?
Repentance and Deliverance at Mizpah
- Mizpah, meaning watch-tower, was situated on a high hill in the territory of Benjamin and served as a traditional gathering place for Israel in times of national crisis.Sources: Mizpah · the Bible text itself
- After being returned by the Philistines, the ark of the Lord was kept for twenty years at Kiriath-jearim in the hill house of Abinadab, whose son Eleazar was consecrated to guard it.Sources: Abinadab · Eleazar · the Bible text itself
- Samuel commemorated the victory over the Philistines by setting up a memorial stone named Ebenezer, meaning stone of help, between Mizpah and Shen.Sources: Ebenezer · Shen · the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Kiriath-jearim · Today: Deir el Azar · 31.809, 35.104 · verses 1, 2
- Ekron · Today: Tel Miqne · 31.777, 34.852 · verse 14
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org