Nations Bible

1 Samuel 25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Devid na Nebal na Abigel

1Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.

2Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel. 3Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.

4Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya, 5o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m. 6Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.

7“ ‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel. 8Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’ ”

9Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa.

10Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ. 11M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?”

12Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru. 13Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche.

14Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba. 15Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị. 16Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ. 17Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”

18Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu. 19Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.

20Mgbe ọ nọ nʼelu ịnyịnya ibu na-agbada ụzọ nke ugwu ahụ ọ hụrụ Devid na ndị agha ya ka ha na-abịa. O zutere ha 21ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya. 22Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.”

23Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid. 24Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, “Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu. 25Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere. 26Ugbu a, onyenwe m, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal. 27Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị.

28“Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha Onyenwe anyị ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 29Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe. 30Mgbe Onyenwe anyị mezuru nye onyenwe m ihe ọma niile nke o kwere na nkwa, meekwa ya onyendu ndị Izrel, 31onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.”

32Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m. 33Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ. 34Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.”

35Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”

36Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ. 37Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume. 38Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ.

39Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.”

Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya. 40Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.”

41Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.” 42Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid. 43Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya. 44Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

David, Nabal, and Abigail

  • The Carmel mentioned in this chapter is not Mount Carmel in northern Israel, but a town in the hill country of Judah near Maon, south of Hebron, where Nabal pastured his vast flocks.Sources: Carmel · Maon · the Bible text itself
  • Sheep-shearing was traditionally a season of feasting and hospitality. Although David's men had provided continuous protection for Nabal's shepherds in the wilderness, Nabal—whose name means Fool—harshly refused David's polite request for provisions.Sources: Nabal · the Bible text itself
  • Abigail averted disaster by quickly bringing extensive provisions—including two hundred loaves of bread, wine skins, butchered sheep, roasted grain, raisin clusters, and fig cakes—and appealing to David's conscience before he could take revenge.Sources: Abigail · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Paran · 30.303, 34.777 · verse 1
  • Maon · Today: Tel Main · 31.409, 35.134 · verse 2

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.