Nations Bible

1 Kings 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Solomọn ewuo Ụlọnsọ Ukwu

1Solomọn bidoro iwu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ nʼọnwa Zif, bụ ọnwa nke abụọ nʼafọ nke anọ nke ịbụ eze ya. Ọ bụkwa nʼafọ nke mere ya narị afọ anọ na iri afọ asatọ site nʼoge ndị Izrel si nʼala Ijipt pụta.

2Ụlọnsọ nke eze Solomọn wuuru Onyenwe anyị dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara, ebe ịla elu ya dịkwa mita iri na anọ. 3Mpụta ọnụ ụlọ nke dị nʼihu ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ahụ dị mita itoolu nʼogologo nke gbakwunyere ihe nʼobosara ụlọnsọ ahụ, dịrịkwa mita anọ na ọkara nʼobosara ya. 4O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ. 5Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu. 6Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.

7Mgbe a na-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ bụ naanị nkume awara nke ọma nʼebe a nọ gwupụta ha ka eji wuo ya. O nweghị onye nụrụ ụzụ itipịa nkume, maọbụ ụzụ ịwa osisi, maọbụ ụdị mkpọtụ ahụ ngwa ọrụ mkpirisi igwe na-eme, nʼebe a nọ wuo ụlọnsọ ukwu ahụ, mgbe a na-ewu ya.

8Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ. 9Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ. 10O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.

11Okwu Onyenwe anyị rutere Solomọn ntị, 12“Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid. 13Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.”

14Emesịa, Solomọn wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ. 15O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile. 16O ji osisi sida kewapụta ihe ruru mita itoolu nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, site nʼala ụlọ ahụ ruo nʼelu, nʼihi iwepụta site nʼụlọnsọ ahụ, ime ime ebe nsọ, nke bụ Ebe Kachasị Nsọ. 17Ụlọ ezumezu nke dị nʼihu ọnụụlọ a dị iri mita na asatọ. 18Ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ bụ osisi sida, nke a tụrụ ihe ọtụtụ nke oyiyi afụfa ọhịa na okoko osisi wasara awasa nʼelu ya. Ihe niile dị nʼime ụlọ ahụ bụ osisi sida, adịghị ahụ nkume ọbụla anya.

19Ọ kwadokwara ebe nsọ ahụ, ebe dị nʼime ime ụlọ ahụ, maka idebe igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼebe ahụ. 20Ime ime ebe nsọ ahụ, dị mita iri nʼogologo, obosara ya dịkwa mita iri, ịdị elu ya dịkwa mita iri. O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọ a niile, jiri osisi sida machie ebe nchụaja ya. 21Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie. 22Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ.

23O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise. 24Cherub nke mbụ nwere nku abụọ, otu nku dị mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, nku nke ọzọ dịkwa mita abụọ na ụma atọ nʼogologo. Ya bụ, mita ise site na ụma isii, site nʼọnụ otu nku ruo nʼọnụ nku nke ọzọ. 25Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu. 26Ịdị elu nke cherub ọbụla ruru mita ise na ụma isii. 27O tinyere cherubim ndị a nke gbasapụrụ nku ha nʼime ime Ebe Nsọ Kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu. Ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ otu akụkụ ahụ ụlọ ahụ, ebe ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ na nke ibe ya nʼetiti ọnụụlọ ahụ. 28O jiri ọlaedo machie cherubim ndị ahụ.

29Nʼahụ aja ụlọnsọ ukwu ahụ gbaa gburugburu, ma nʼime ọnụụlọ nke dị nʼime na ndị dị na mpụta, ka ọ pịkwasịrị oyiyi cherubim, osisi nkwụ na okoko osisi wara awa. 30O jikwa ọlaedo machie ala ụlọ nke ọnụụlọ niile dị nʼime ụlọ, na ọnụụlọ ndị dị na mpụta ụlọnsọ ukwu ahụ.

31O ji osisi oliv mee ibo ọnụ ụzọ mbata nke ime ime ebe nsọ ahụ, osisi ndị a bụ otu ụzọ nʼụzọ ise nke obosara ebe nsọ ahụ. 32Nʼahụ ibo abụọ ahụ nke si nʼosisi oliv, ọ tụnyere oyiyi cherubim abụọ, igu nkwụ na okoko osisi wara awa. O ji ọlaedo etipịara etipịa machie oyiyi cherubim na igu nkwụ ndị ahụ. 33Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ. 34O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu. 35Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.

36O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.

37Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 38Ọ bụ nʼime afọ iri na otu, nʼọnwa Bul, ya bụ ọnwa nke asatọ, ka e wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼihe niile ya dịka ntụziaka e nyere si dị. Ọ bụ afọ asaa ka o weere ya i ji rụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Building of the Temple

  • The stone blocks for the temple were dressed entirely at the quarry, ensuring that no sound of hammers, chisels, or other iron tools was heard at the building site during construction.Sources: the Bible text itself
  • The entire interior of the temple was paneled with cedar and cypress and overlaid with pure gold, completely hiding the stone walls. In the inner sanctuary, two cherubim carved from olive wood and covered in gold stood ten cubits high with their outspread wings touching opposite walls.Sources: the Bible text itself · Most Holy Place
  • According to the biblical record, the foundation was laid in the second month of Solomon's fourth regnal year, 480 years after the Exodus from Egypt. The entire project took seven years, concluding in the eighth month of his eleventh year.Sources: the Bible text itself · Reign of Solomon · Construction of Solomon's Temple

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Egypt · 30.129, 31.308 · verse 1
  • Holy Place · Today: on Mount Moriah · 31.778, 35.236 · verse 5
  • Most Holy Place · Today: on Mount Moriah · 31.778, 35.236 · verses 16, 17, 21, 22

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.