Nations Bible

1 Kings 12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ọchịchị Rehoboam

1Rehoboam gara Shekem, nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze. 2Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ ka nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn), o sitere Ijipt lọta. 3Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ọgbakọ Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya: 4“Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị, dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”

5Rehoboam zara ha sị, “Laanụ, ụbọchị atọ gasịa unu bịaghachikwutenụ m.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.

6Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”

7Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-abụ odibo nye ndị a taa, jeere ha ozi, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.”

8Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ. 9Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ”

10Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m. 11Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ”

12Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.” 13Eze sara ndị a okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ nke ndị okenye nyere ya, 14ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere. Ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.” 15Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.

16Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị,

“Olee oke anyị nwere nʼime Devid?

Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi?

Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu!

Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.”

Ya mere, ndị Izrel lara nʼụlọ ha. 17Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha.

18Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram, onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye, ma ndị Izrel niile ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem. 19Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.

20Mgbe ndị Izrel nụrụ na Jeroboam alaghachitala, ha ziri ya ozi sị ya pụta nʼihu ọha mmadụ. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee ya eze Izrel. Ọ dịghị ebo ọbụla kwenyere iso ụlọ Devid, karịakwa ebo Juda.

21Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam, nwa Solomọn.

22Ma okwu Chineke rutere Shemaya onye nke Chineke ntị, sị, 23“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na ndị Juda niile, na Benjamin na ndị ọzọ niile, sị ha, 24Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu Onyenwe anyị, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

Oyiyi ehi ọlaedo dị na Betel na Dan

25Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.

26Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid. 27Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.”

28Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.” 29Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan. 30Ihe a ghọrọ mmehie dịrị ha, nʼihi na ndị mmadụ na-abịa kpọọ isiala nye nke dị na Betel ma gaakwa ebe dị anya, dịka Dan, nʼihi ife ehi ọlaedo nke dị nʼebe ahụ ofufe.

31Jeroboam wuru ebe ịchụ aja nʼebe dị elu dị iche iche. Ọ họpụtara ndị nchụaja site nʼetiti ndị Izrel niile, nʼagbanyeghị na ha abụghị ndị Livayị. 32O hiwere mmemme a na-eme nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke asatọ, dịka mmemme a na-eme na Juda. Ọ chụkwara aja nʼebe ịchụ aja. O mere nke a na Betel, chụọrọ ụmụ ehi ọlaedo ahụ ọ kpụrụ aja. O tinyere ndị nchụaja nʼọrụ nʼebe niile dị elu nke o mere ka ha dịrị na Betel. 33Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa asatọ, bụ ọnwa nke ya onwe ya chepụtara, ọ chụrụ aja dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja o wuru na Betel. Ya mere, o hiwere mmemme a ka ọ dịịrị ndị Izrel niile; ya onwe ya kwa gara chụọ aja onyinye dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Division of the Kingdom

  • When the northern tribes gathered at Shechem requesting lighter taxes and labor burdens, Rehoboam rejected the counsel of Solomon's elders and threatened harsher measures. This triggered the division of the united monarchy, fulfilling the prophecy previously spoken by Ahijah the Shilonite.Sources: the Bible text itself · Rehoboam · Ahijah · Shechem
  • To prevent his subjects from traveling to the temple in Jerusalem, King Jeroboam set up two golden calves for worship at opposite ends of the northern kingdom, placing one in Bethel and the other in Dan. He also established shrines on high places and appointed priests who were not from the tribe of Levi.Sources: the Bible text itself · Jeroboam · Bethel (of Palestine) · Dan

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Shechem · Today: Tell Balatah · 32.214, 35.282 · verses 1, 25
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verses 2, 20, 28
  • Shiloh · Today: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · verse 15
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 18, 21, 27, 28
  • Dan · Today: Tel Dan · 33.249, 35.652 · verses 29, 30

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.