1 John 5
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Okwukwe nʼime Ọkpara Chineke
1Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya. 2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. 3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ. 4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị. 5Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
6Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu. 7Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe: 8Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara. 9Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 10Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 11Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. 12Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
Ime okwu ka o wee anya
13Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. 14Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị. 15Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
16Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ. 17Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.
18Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka. 19Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ. 20Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi.
21Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.

Did you know?
Faith, Testimony, and Life
- This chapter says that everyone who believes Jesus is the Christ has been born of God, and that loving the Father also means loving those born of him. It describes love for God as keeping his commandments, which are not burdensome, because everyone born of God overcomes the world, and it calls that victory faith in Jesus as the Son of God.Sources: the Bible text itself
- Jesus Christ is said to have come by water and blood, not by water alone, and the Spirit is said to testify to this because the Spirit is the truth; the chapter does not explain here what the water and the blood are. It names the Spirit, the water, and the blood as three that testify in agreement, and calls God’s testimony about his Son greater than human testimony: God has given us eternal life, and this life is in his Son. The writer says he wrote these things so that those who believe in the name of the Son of God may know that they have eternal life.Sources: the Bible text itself
- Readers are told to ask God for a brother who commits a sin that does not lead to death, while the writer says he is not telling them to ask about a sin that does lead to death. He does not name either sin, though he says that all unrighteousness is sin and that there is sin that does not lead to death. The chapter ends by telling little children to keep themselves from idols.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org