1 Corinthians 6
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ọ dị njọ ịga nʼụlọikpe
1Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ? 2Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu? 3Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a? 4Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya? 5Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya? 6Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe!
7Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu? 8Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst. 9Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, 10ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke. 11Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume.
Mmehie ịkwa iko
12Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m. 13Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị. 14Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie. 15Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa! 16Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” 17Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.
18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. 19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. 20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

Did you know?
Lawsuits, the Kingdom, and the Body
- The chapter challenges believers who take a grievance against another to law before the unrighteous instead of before the saints. It argues that people who will judge the world, and even angels, should be able to judge trivial everyday cases, and it treats a lawsuit between brothers—especially before unbelievers—as a defeat already suffered.Sources: the Bible text itself
- It warns that the wicked will not inherit the kingdom of God, naming the sexually immoral, idolaters, adulterers, men who submit to or perform homosexual acts, thieves, the greedy, drunkards, verbal abusers, and swindlers. It then says that some of the readers once were such people, but were washed, sanctified, and justified in the name of the Lord Jesus Christ and by the Spirit of our God.Sources: the Bible text itself
- Quoted claims—“Everything is permissible for me” and “Food for the stomach and the stomach for food”—are answered with limits: not everything is beneficial, and the body is for the Lord, not for sexual immorality. Uniting with a prostitute is said to make two people one flesh, while uniting with the Lord is one spirit with him; the body is called a temple of the Holy Spirit, and the readers are told they were bought at a price.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org