Nations Bible

1 Corinthians 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Oziọma banyere Kraịst na obe ya

1Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke. 2Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe. 3Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji. 4Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya. 5Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.

Amamihe Chineke

6Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. 7Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. 8O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. 9Ma dịka e dere ya,

“Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị,

ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị,

ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya,

bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”

10Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya.

Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi. 11Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke. 12Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị. 13Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ. 14Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ. 15Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta. 16Nʼihi na,

“Onye maara uche Onyenwe anyị

ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?”

Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Christ crucified and the Spirit's wisdom

  • The writer says he did not come with eloquence or wisdom when he proclaimed the testimony about God. He had resolved to know nothing while he was with them except Jesus Christ and him crucified, and he came in weakness, fear, and much trembling, so their faith would rest on God's power rather than on human wisdom.Sources: the Bible text itself
  • The wisdom spoken among the mature is not the wisdom of this age or of its rulers, who are coming to nothing. It is called God's mysterious, hidden wisdom, destined for glory before time began; those rulers did not understand it, or they would not have crucified the Lord of glory.Sources: the Bible text itself
  • The chapter says God has revealed by the Spirit what lies beyond human sight, hearing, and imagination. Only a person's own spirit knows that person's thoughts, and only the Spirit of God knows God's thoughts. The natural person does not accept what comes from the Spirit, treats it as foolishness, and cannot understand it, because it is spiritually discerned.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.